@mkings on Quibbles

@mkings

Joined August 2026

Commented on Friday language Contest is open!!! Send in your story and stand a chance to Win

Language ·

Ịrụsi Ọrụ Ike Adịghị Ezu Aha ya bụ Chukwudi. Site na mgbe ọ bụ nwata, Chukwudi maara ihe ọ chọrọ ná ndụ. Ọ chọrọ ịga ụlọ akwụkwọ, mụọ nke ọma, bụrụ onye injinia, ma mee ka ndụ ezinụlọ ya ka mma. Nne ya na-agwakarị ya, sị: «“Nwa m, gbalịa. Onye rụsiri ọrụ ike, ndụ ga-emeghe ụzọ nye ya.”» Chukwudi kwenyere ya. Kwa ụtụtụ, ọ na-ebili tupu chi abọọ. Ọ na-aga ụlọ akwụkwọ, na-amụ ihe ruo mgbede. Mgbe ụmụ akwụkwọ ibe ya na-aga ezumike, Chukwudi na-arụ ọrụ nta iji nweta ego akwụkwọ na nri. Ọ naghị eme mkpesa. Ọ naghị ada mbà. Mgbe ụfọdụ, agụụ na-agụ ya, ma ọ ka na-amụ akwụkwọ

2